Ọkwa maka nzukọ nke abụọ nke Kọmitii Ahịa Isi Ego (CMC) na 2019 E bipụtara: Ọgọọst 15, 2019
A haziri Nzukọ Nke Abụọ nke Kọmitii Ahịa Isi Ego (CMC) na 2019 ka ọ bụrụ na Tọzdee, 22 Ọgọst 2019 na Grand Ballroom, Eko Hotels & Suites, 1415, Adetokunbo Ademola Street, Victoria Island, Lagos.
Mkparịta ụka a na-emekarị na ndị nta akụkọ ga-abụ n'echi ya, ya bụ Fraịdee, 23 Ọgọst 2019 na SEC Lagos Zonal Office, 3, Idejo Street, Victoria Island, Lagos.
Ịga ihe omume abụọ a bụ naanị site na ọkpụkpọ òkù. A tụrụ anya na ndị a kpọrọ ga-eweta kaadị njirimara ha ka e nwee ike ikwe ka ha banye ebe ihe omume ahụ ga-adị.
A na-atụ anya ka ndị niile a kpọrọ òkù nọrọ n'oche ha tupu ma ọ bụ n'oge 9.45am.
Daalụ
Ndị nchịkwa binyere aka