Ọkwa Banyere Ndebanye Aha Mainland Trust Limited A Kagburu E bipụtara: Maachị 14, 2025
ỌKWA ỌHA NA EZE
Ọkwa Banyere Ndebanye Aha Mainland Trust Limited A Kagburu
Securities and Exchange Commission (“Kọmishọn ahụ”) ji nke a na-agwa ọha na eze na ndebanye aha Mainland Trust Limited dịka onye ọrụ ahịa isi ego a kagburu ozugbo.
E nyere iwu ịkagbu a site n'ike iwu nyere Kọmishọn ahụ n'okpuru Nkebi 38(4) nke Investments and Securities Act, 2007 na Iwu 34(1)(e) nke Iwu na Ụkpụrụ SEC E Jikọtara Ọnụ 2013. Mkpebi Kọmishọn ahụ sitere na ụlọ ọrụ ahụ erubeghị ntuziaka ndị na-achịkwa ahịa ma dozieghị ọtụtụ mkpesa e mere megide ya.
Site n'ọkwa a, a na-adụ ndị ahịa Mainland Trust Limited niile ọdụ ka ha kpọtụrụ Central Securities Clearing Systems Plc (CSCS) ka ha nweta ntụziaka kwesịrị ekwesị maka ibufe òkè ụlọ ọrụ ha nye onye ọzọ ha họọrọ na-azụ ma na-ere òkè ụlọ ọrụ.
Ọzọkwa, e nyere Nigerian Exchange Group (NGX), Institute of Capital Market Registrars (ICMR), Chartered Institute of Stockbrokers (CIS), Central Securities Clearing System (CSCS) Plc na òtù ọrụ ahịa isi ego niile ntụziaka ka ha kwụsị ịrụkọ ọrụ metụtara ahịa isi ego na ụlọ ọrụ ahụ.
A BINYERE AKA
NDỊ NCHỊKWA